Ọpụpụ 35

Ụmụ nwanyị ndị bụ ọka nʼịdụ akwa na ikwe akwa tụrụ eri na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, nke na-acha uhie uhie na nke ezi akwa ọcha, webata ha dịka onyinye.

Exodus 35:25 (UKJV) And all the women that were wise hearted did spin with their hands, and brought that which they had spun, both of blue, and of purple, and of scarlet, and of fine linen.

23Ụfọdụ mmadụ wetara akwa na-acha anụnụ anụnụ na ngwakọta anụnụ na uhie na nke uhie uhie maọbụ ezi akwa ọcha maọbụ akpụkpọ ajị ewu, akpụkpọ ebule e sijiri ọbara ọbara na akpụkpọ ehi mmiri.

24Ndị ọzọ wetara ọlaọcha na bronz, dịka onyinye ha nyere Onyenwe anyị, ụfọdụ wetara osisi akashia nke a ga-eji wuo ụlọ ikwu ahụ.

25Ụmụ nwanyị ndị bụ ọka nʼịdụ akwa na ikwe akwa tụrụ eri na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, nke na-acha uhie uhie na nke ezi akwa ọcha, webata ha dịka onyinye.

26Ụfọdụ ụmụ nwanyị kwa ji onyinye ǹka pụrụ iche ha nwere kpaa ajị ewu dịka akwa pụrụ iche.

27Ndị ndu niile wetakwara nkume ọniks na nkume ndị ọzọ nke ịhịọnye nʼihe a ga-eji dụọ efọọd na ihe mgbochi obi ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.