Ọpụpụ 35

Unu amụnyela ọkụ nʼebe obibi unu nʼụbọchị izuike ahụ.”

Exodus 35:3 (UKJV) All of you shall kindle no fire throughout your habitations upon the sabbath day.

1Emesịa, Mosis kpọrọ nzukọ ụmụ Izrel niile gwa ha sị, “Ndị a bụ iwu Onyenwe anyị nyere nke unu na-aghaghị idebe.

2Rụọnụ ọrụ ụbọchị isii, ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike, ụbọchị dị nsọ nke izuike nye Onyenwe anyị. Onye ọbụla rụrụ ọrụ nʼụbọchị nke asaa ga-anwụ.

3Unu amụnyela ọkụ nʼebe obibi unu nʼụbọchị izuike ahụ.”

4Mgbe ahụ Mosis gwara nzukọ Izrel niile sị, “Nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere,

5sitenụ nʼihe unu nwere wetara Onyenwe anyị onyinye. Onye ọbụla nke ọ masịrị, ya wetara Onyenwe anyị onyinye nke ihe ndị a: “Ọlaọcha, ọlaedo na bronz,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.