3Unu amụnyela ọkụ nʼebe obibi unu nʼụbọchị izuike ahụ.”
4Mgbe ahụ Mosis gwara nzukọ Izrel niile sị, “Nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere,
5sitenụ nʼihe unu nwere wetara Onyenwe anyị onyinye. Onye ọbụla nke ọ masịrị, ya wetara Onyenwe anyị onyinye nke ihe ndị a: “Ọlaọcha, ọlaedo na bronz,
6ogho na-acha anụnụ anụnụ, nke odo odo, nke uhie uhie na nke ezi akwa ọcha, na ajị ewu;
7akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie, akpụkpọ ehi mmiri, na osisi akashia;