5sitenụ nʼihe unu nwere wetara Onyenwe anyị onyinye. Onye ọbụla nke ọ masịrị, ya wetara Onyenwe anyị onyinye nke ihe ndị a: “Ọlaọcha, ọlaedo na bronz,
6ogho na-acha anụnụ anụnụ, nke odo odo, nke uhie uhie na nke ezi akwa ọcha, na ajị ewu;
7akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie, akpụkpọ ehi mmiri, na osisi akashia;
8mmanụ oliv nke a ga-etinye nʼiheọkụ, ụda a na-etinye na mmanụ nsọ, na ụda na-eme ka aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ;
9nkume ọma ọniks, na nkume ndị ọzọ a na-ahịọnye nʼefọọd, na nke a na-ahịọnyekwa nʼihe mgbochi obi.