Ọpụpụ 37

O ji ọlaedo a nụchara anụcha machie nʼime na azụ ya, jirikwa ọlaedo kpụọ ihe gburugburu akụkụ ya niile.

Exodus 37:2 (UKJV) And he overlaid it with pure gold within and without, and made a crown of gold to it round about.

1Bezalel ji osisi akashia wuo igbe ọgbụgba ndụ nke ịdị ogologo ya bụ otu mita na sentimita iri. Obosara ya ga-abụ sentimita iri isii na asatọ. Ịla elu ya ga-abụkwa sentimita iri isii na asatọ.

2O ji ọlaedo a nụchara anụcha machie nʼime na azụ ya, jirikwa ọlaedo kpụọ ihe gburugburu akụkụ ya niile.

3Ọ kpụrụ mgbaaka ọlaedo anọ maka ya, kwụnyekwa ha nʼụkwụ anọ ya, ya bụ mgbaaka abụọ nʼotu akụkụ, mgbaaka abụọ nʼakụkụ nke ọzọ ya.

4O jikwa osisi akashia ahụ mee okporo osisi, machiekwa ha ọlaedo.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.