2O ji ọlaedo a nụchara anụcha machie nʼime na azụ ya, jirikwa ọlaedo kpụọ ihe gburugburu akụkụ ya niile.
3Ọ kpụrụ mgbaaka ọlaedo anọ maka ya, kwụnyekwa ha nʼụkwụ anọ ya, ya bụ mgbaaka abụọ nʼotu akụkụ, mgbaaka abụọ nʼakụkụ nke ọzọ ya.
4O jikwa osisi akashia ahụ mee okporo osisi, machiekwa ha ọlaedo.
5O tinyekwara mkpara ndị ahụ nʼime mgbaaka ahụ dị nʼakụkụ igbe ahụ; ka ọ bụrụ ihe iji na-ebu ya.
6Emesịa, o ji ọlaedo a nụchara anụcha mee ihe e ji ekwuchi igbe ahụ. Aha a na-akpọ okwuchi igbe a bụ Oche Ebere. Ịdị ogologo ya dị otu mita na sentimita iri, obosara ya dị iri sentimita asaa.