Ọpụpụ 37

O tinyekwara mkpara ndị ahụ nʼime mgbaaka ahụ dị nʼakụkụ igbe ahụ; ka ọ bụrụ ihe iji na-ebu ya.

Exodus 37:5 (UKJV) And he put the staves into the rings by the sides of the ark, to bear the ark.

3Ọ kpụrụ mgbaaka ọlaedo anọ maka ya, kwụnyekwa ha nʼụkwụ anọ ya, ya bụ mgbaaka abụọ nʼotu akụkụ, mgbaaka abụọ nʼakụkụ nke ọzọ ya.

4O jikwa osisi akashia ahụ mee okporo osisi, machiekwa ha ọlaedo.

5O tinyekwara mkpara ndị ahụ nʼime mgbaaka ahụ dị nʼakụkụ igbe ahụ; ka ọ bụrụ ihe iji na-ebu ya.

6Emesịa, o ji ọlaedo a nụchara anụcha mee ihe e ji ekwuchi igbe ahụ. Aha a na-akpọ okwuchi igbe a bụ Oche Ebere. Ịdị ogologo ya dị otu mita na sentimita iri, obosara ya dị iri sentimita asaa.

7Mgbe ahụ, o ji ọlaedo a nụchara anụcha, nke e tipịara etipịa, kpụọ cherubim abụọ na nsọtụ abụọ nke ebe mkpuchi ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.