Ọpụpụ 37

Mgbe ahụ, o ji ọlaedo a nụchara anụcha, nke e tipịara etipịa, kpụọ cherubim abụọ na nsọtụ abụọ nke ebe mkpuchi ahụ.

Exodus 37:7 (UKJV) And he made two cherubims of gold, beaten out of one piece made he them, on the two ends of the mercy seat;

5O tinyekwara mkpara ndị ahụ nʼime mgbaaka ahụ dị nʼakụkụ igbe ahụ; ka ọ bụrụ ihe iji na-ebu ya.

6Emesịa, o ji ọlaedo a nụchara anụcha mee ihe e ji ekwuchi igbe ahụ. Aha a na-akpọ okwuchi igbe a bụ Oche Ebere. Ịdị ogologo ya dị otu mita na sentimita iri, obosara ya dị iri sentimita asaa.

7Mgbe ahụ, o ji ọlaedo a nụchara anụcha, nke e tipịara etipịa, kpụọ cherubim abụọ na nsọtụ abụọ nke ebe mkpuchi ahụ.

8A rụnyere otu cherub nʼotu nsọtụ, otu cherub na nsọtụ nke ọzọ; nʼisi nsọtụ abụọ ahụ, ka o jikọtara ha ọnụ ka ha na okwuchi igbe ahụ bụrụ otu.

9Cherubim ndị a gbasara nku ha laa elu, were ha na-ekpuchi okwuchi ahụ. Cherubim ndị ahụ cherịtara onwe ha ihu, na-ele anya nʼebe okwuchi ahụ dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.