Ọpụpụ 38

Ha mere ngịga mbadamba maka ebe ịchụ aja ahụ, ihe ọkpụkpa bronz, nke ga-adị nʼokpuru oghere ọnụ ọnụ ya.

Exodus 38:4 (UKJV) And he made for the altar a brazen grate of network under the compass thereof beneath unto the midst of it.

2Ha rụnyekwara mpi nʼakụkụ anọ nke ebe ịchụ aja ahụ nʼotu nʼotu. Mee ka mpi ndị a na ebe ịchụ aja ahụ ghọọ nke e jikọtara nʼotu. Ha jikwa bronz machie ebe ịchụ aja a.

3Ha ji bronz kpụọ ngwongwo niile dị iche iche, ya bụ efere ikpofu ntụ, shọvel ya niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ngaji eze ịdụta anụ na efere ndị e ji agụ ọkụ.

4Ha mere ngịga mbadamba maka ebe ịchụ aja ahụ, ihe ọkpụkpa bronz, nke ga-adị nʼokpuru oghere ọnụ ọnụ ya.

5Ha kpụrụ mgbaka bronz ndị a ga-eji jide mkpara ndị ahụ maka akụkụ anọ nke ngịga bronz ahụ.

6Ha mere mkpara osisi akashia ndị a, were bronz machie ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.