3Ha ji bronz kpụọ ngwongwo niile dị iche iche, ya bụ efere ikpofu ntụ, shọvel ya niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ngaji eze ịdụta anụ na efere ndị e ji agụ ọkụ.
4Ha mere ngịga mbadamba maka ebe ịchụ aja ahụ, ihe ọkpụkpa bronz, nke ga-adị nʼokpuru oghere ọnụ ọnụ ya.
5Ha kpụrụ mgbaka bronz ndị a ga-eji jide mkpara ndị ahụ maka akụkụ anọ nke ngịga bronz ahụ.
6Ha mere mkpara osisi akashia ndị a, were bronz machie ha.
7Ha mere ka mkpara ndị ahụ baa nʼime mgbaaka ndị ahụ, ime ka ha dịrị nʼakụkụ abụọ nke ebe ịchụ aja ahụ maka iji nʼebu ya. Ha ji obodobo osisi rụọ ya dịka igbe.