Ọpụpụ 38

Ha mere ka mkpara ndị ahụ baa nʼime mgbaaka ndị ahụ, ime ka ha dịrị nʼakụkụ abụọ nke ebe ịchụ aja ahụ maka iji nʼebu ya. Ha ji obodobo osisi rụọ ya dịka igbe.

Exodus 38:7 (UKJV) And he put the staves into the rings on the sides of the altar, to bear it likewise; he made the altar hollow with boards.

5Ha kpụrụ mgbaka bronz ndị a ga-eji jide mkpara ndị ahụ maka akụkụ anọ nke ngịga bronz ahụ.

6Ha mere mkpara osisi akashia ndị a, were bronz machie ha.

7Ha mere ka mkpara ndị ahụ baa nʼime mgbaaka ndị ahụ, ime ka ha dịrị nʼakụkụ abụọ nke ebe ịchụ aja ahụ maka iji nʼebu ya. Ha ji obodobo osisi rụọ ya dịka igbe.

8Ha ji bronz kpụọ efere ukwu na ihe ndọkwasị ya. Ọ bụ enyo nke ndị inyom ahụ ndị na-eje ozi nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ka e ji kpụọ ha.

9Ọzọ, ha mere ogige ahụ. Ịdị ogologo nke nʼakụkụ ndịda dị iri mita anọ na ise. O nwere akwa mgbochi nke e ji ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.