Ọpụpụ 39

Ọ bụ akwa nke na-acha anụnụ anụnụ, ka ha ji dụọ uwe mwụda efọọd ahụ, ọrụ onye okwe akwa.

Exodus 39:22 (UKJV) And he made the robe of the ephod of woven work, all of blue.

20Mgbe ahụ, ha kpụrụ mgbaaka ọlaedo abụọ ọzọ, konyekwa ha nʼelu ubu abụọ nke efọọd ahụ, nʼokpuru nʼebe ihu ya, na nso nso ebe a dụkọtara, nʼelu ihe okike ukwu nke efọọd ahụ.

21Ha jikwa eriri na-acha anụnụ kekọta mgbaaka ihe mgbochi obi ahụ na mgbaaka efọọd ahụ, jikọta ya na ihe okike ukwu ahụ, ime ka ihe mgbochi obi ahụ hapụ ịtọghapụ site nʼefọọd ahụ, dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.

22Ọ bụ akwa nke na-acha anụnụ anụnụ, ka ha ji dụọ uwe mwụda efọọd ahụ, ọrụ onye okwe akwa.

23A ga-enwe oghere nʼetiti uwe mwụda ahụ, dịka oghere olu uwe agha, nwekwa akwa nta a dụnyere nʼokpuru oghere a, ime ka o sie ike gharakwa ịdọka.

24Ha ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, nke na-acha uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma kpanye oyiyi mkpụrụ pomegranet, gburugburu nʼọnụ ala ala uwe mwụda ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.