22Ọ bụ akwa nke na-acha anụnụ anụnụ, ka ha ji dụọ uwe mwụda efọọd ahụ, ọrụ onye okwe akwa.
23A ga-enwe oghere nʼetiti uwe mwụda ahụ, dịka oghere olu uwe agha, nwekwa akwa nta a dụnyere nʼokpuru oghere a, ime ka o sie ike gharakwa ịdọka.
24Ha ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, nke na-acha uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma kpanye oyiyi mkpụrụ pomegranet, gburugburu nʼọnụ ala ala uwe mwụda ahụ.
25Ha dụnyekwara ataṅụ e ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ, gburugburu nʼọnụ ọnụ ala ya nʼetiti pomegranet ndị ahụ.
26Otu ataṅụ, otu oyiyi mkpụrụ pomegranet, otu a ka a dụnyere ya gburugburu ọnụ ọnụ ala uwe mwụda ahụ, nke a ga-eyi mgbe a na-eje ozi, dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.