Ọpụpụ 4

Onyenwe anyị sịrị ya, “Tụpụ ya nʼala.” Mosis tụpụrụ ya nʼala. Ma otu mgbe ahụ, ọ ghọrọ agwọ. Mosis sitere nʼebe agwọ ahụ nọ gbapụ ọsọ.

Exodus 4:3 (UKJV) And he said, Cast it on the ground. And he cast it on the ground, and it became a serpent; and Moses fled from before it.

1Mosis zaghachiri ya sị, “Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na ha agaghị ekwenye ihe m kwuru maọbụ ajụ ige m ntị? Ọ bụrụ na ha asị, ‘Onyenwe anyị egosighị gị onwe ya.’ ”

2Ma Onyenwe anyị jụrụ Mosis ajụjụ sị ya, “Gịnị ka i ji nʼaka?” Mosis zara sị, “Ọ bụ mkpanaka.”

3Onyenwe anyị sịrị ya, “Tụpụ ya nʼala.” Mosis tụpụrụ ya nʼala. Ma otu mgbe ahụ, ọ ghọrọ agwọ. Mosis sitere nʼebe agwọ ahụ nọ gbapụ ọsọ.

4Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ọzọ sị ya, “Jide agwọ ahụ aka nʼọdụdụ ya.” Mgbe Mosis mere nke a, agwọ ahụ ghọghachikwara mkpanaka.

5Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Ọ bụrụ na i mee ihe ịrịbama a, ha ga-ekwere ihe ị gwara ha. Ha ga-aghọta na Onyenwe anyị Chineke nna nna ha, Chineke Ebraham, Chineke Aịzik, na Chineke Jekọb gosiri gị onwe ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.