Ọpụpụ 40

Mosis mere ka ụlọ nzute ahụ guzo ọtọ site nʼitinye mbudo ibo ya niile, ụkwụ ya na mkpọrọ osisi ya niile nʼọnọdụ ha.

Exodus 40:18 (UKJV) And Moses reared up the tabernacle, and fastened his sockets, and set up the boards thereof, and put in the bars thereof, and reared up his pillars.

16Mosis mezuru ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu ime.

17O ruo, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ, nʼafọ nke abụọ, e mere ka ụlọ nzute ahụ guzo ọtọ.

18Mosis mere ka ụlọ nzute ahụ guzo ọtọ site nʼitinye mbudo ibo ya niile, ụkwụ ya na mkpọrọ osisi ya niile nʼọnọdụ ha.

19Emesịa, ọ gbasapụrụ ihe mkpuchi nʼelu ụlọ nzute ahụ, tụkwasịkwa okpukpu ihe mkpuchi nke abụọ nʼelu ya dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu.

20O tinyere Ihe Ama nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Emesịa, ọ tụkwasịkwara mkpara e ji ebu igbe ahụ nʼakụkụ igbe ahụ, were okwuchi igbe ahụ, nke bụ Oche Ebere ahụ, kpuchie igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.