4Webata tebul ahụ, na ngwongwo dị nʼelu ya, webatakwa ihe ịdọba oriọna ahụ. Mụnyekwa oriọna ndị ahụ ọkụ.
5Doo ebe ịchụ aja ọlaedo ahụ nke e mere maka ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼihu igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ. Konyekwa akwa mgbochi nke kwesiri ịdị nʼọnụ ụzọ e si abata nʼime ụlọ nzute ahụ.
6“Doo ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ nʼihu ọnụ ụzọ ịbata nʼụlọ nzute bụ ụlọ ikwu ahụ.
7Dọnye efere ukwu ịsa mmiri ahụ nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja ahụ. Gbajukwaa ya mmiri.
8Guzobe ogige gburugburu ụlọ nzute ahụ. Konyekwa akwa mgbochi nʼọnụ ụzọ ogige ahụ.