14Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Obi Fero siri ike. Ọ bụ nke a mere o ji na-aga nʼihu na-ajụ ka ndị m laa.
15Ma otu ọ dị; nʼisi ụtụtụ echi, jekwuru Fero tupu ọ gaa nʼosimiri. Guzoro nʼakụkụ osimiri Naịl, jidekwa mkpanaka ahụ ghọrọ agwọ nʼaka gị.
16Ị ga-agwa Fero sị, ‘Onyenwe anyị, Chineke ndị Hibru, ezitela m ka m gwa gị sị, hapụ ndị m ka ha gaa nʼọzara fee m ofufe. Tutu ruo ugbu a, ị jụrụ ige ntị.’
17Ugbu a Onyenwe anyị kwuru nke a sị, ‘Ị ga-amata site na nke a na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. Aga m ewere mkpanaka a nke m ji nʼaka tie nʼosimiri Naịl. Ọ ga-agbanwe ghọọ ọbara.
18Azụ niile dị nʼime ya ga-anwụ. Osimiri ahụ ga-esikwa isi dịka ihe rere ure. Nke a ga-eme ka ọ bụrụ ihe rara ahụ nye ndị Ijipt ịṅụ mmiri site na ya.’ ”