Ọpụpụ 8

Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Bilie nʼisi ụtụtụ echi jekwuru Fero. Mgbe ọ ga-aga nʼosimiri, gwa ya okwu sị, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe.

Exodus 8:20 (UKJV) And the LORD said unto Moses, Rise up early in the morning, and stand before Pharaoh; lo, he comes forth to the water; and say unto him, Thus says the LORD, Let my people go, that they may serve me.

18Ndị Ijipt na-eme majiki gbalịrị iji ihe nzuzo ha mee otu ihe ahụ Erọn mere, ma ha enweghị ike ime ka anwụ nta ọbụla pụta. Ebe ọ bụ na anwụ nta ndị a jupụtara nʼahụ mmadụ na nʼahụ anụmanụ niile.

19Naanị ihe ndị na-eme majiki gwara Fero bụ, “Nke a bụ akaọrụ Chineke.” Ma Fero mere ka obi ya sie ike. Ọ chọghị ige, ọ bụladị ndị majiki ya ntị, dịka Onyenwe anyị kwuru na ọ ga-eme.

20Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Bilie nʼisi ụtụtụ echi jekwuru Fero. Mgbe ọ ga-aga nʼosimiri, gwa ya okwu sị, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe.

21Ọ bụrụ na ị chọghị ime otu a, aga m eme ka igwe ijiji jupụta nʼala Ijipt niile. Ha ga-ejupụta gị nʼahụ na nʼahụ ndị na-ejere gị ozi, na nʼahụ ndị gị niile, na nʼime ụlọ unu niile.

22“ ‘Nʼụbọchị ahụ, igwe ijiji ndị a agaghị emetụ ndị nọ na Goshen ebe ndị m bi. Mgbe ahụ ka ị ga-amata na mụ bụ Onyenwe anyị bịara ije nʼala a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.