19Naanị ihe ndị na-eme majiki gwara Fero bụ, “Nke a bụ akaọrụ Chineke.” Ma Fero mere ka obi ya sie ike. Ọ chọghị ige, ọ bụladị ndị majiki ya ntị, dịka Onyenwe anyị kwuru na ọ ga-eme.
20Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Bilie nʼisi ụtụtụ echi jekwuru Fero. Mgbe ọ ga-aga nʼosimiri, gwa ya okwu sị, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe.
21Ọ bụrụ na ị chọghị ime otu a, aga m eme ka igwe ijiji jupụta nʼala Ijipt niile. Ha ga-ejupụta gị nʼahụ na nʼahụ ndị na-ejere gị ozi, na nʼahụ ndị gị niile, na nʼime ụlọ unu niile.
22“ ‘Nʼụbọchị ahụ, igwe ijiji ndị a agaghị emetụ ndị nọ na Goshen ebe ndị m bi. Mgbe ahụ ka ị ga-amata na mụ bụ Onyenwe anyị bịara ije nʼala a.
23Aga m emekwa ka ọ pụta ìhè na o nwere ihe dị iche nʼetiti ndị m na ndị gị. Ihe ịrịbama a ga-emezukwa echi.’ ”