Ọpụpụ 8

Ma ndị majiki Ijipt jikwa ihe nzuzo ha mee ihe ahụ Mosis na Erọn mere. Ha mekwara ka awọ jupụta ala ahụ niile.

Exodus 8:7 (UKJV) And the magicians did so with their enchantments, and brought up frogs upon the land of Egypt.

5Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Gwa Erọn, ‘Setịpụ aka gị ya na mkpanaka gị nʼelu osimiri niile, na mmiri nta na ọdọ mmiri ndị Ijipt, mee ka awọ jupụta ala Ijipt niile.’ ”

6Erọn setịpụrụ aka nʼelu mmiri niile nke Ijipt, awọ pụtara kpuchie ala ahụ niile.

7Ma ndị majiki Ijipt jikwa ihe nzuzo ha mee ihe ahụ Mosis na Erọn mere. Ha mekwara ka awọ jupụta ala ahụ niile.

8Fero kpọrọ Mosis na Erọn rịọọ ha sị, “Rịọọnụ Onyenwe anyị ka o wepụrụ mụ na ndị m awọ ndị a. Emesịa aga m ekwe ka ndị gị gaa chụọrọ Onyenwe anyị aja.”

9Mosis zaghachiri Fero sị, “Gị ka ọ dịrị ịgwa m mgbe m ga-arịọ arịrịọ a nʼisi gị na nʼisi ndị gị, ka e wezuga awọ ndị a site nʼụlọ unu, ma hapụ naanị ndị nọ nʼosimiri Naịl.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.