Ọpụpụ 9

Mgbe ahụ Fero ziri ozi ka a kpọ Mosis na Erọn. O kwupụtara nʼihu ha sị, “Nʼoge a, emehiela m. Onyenwe anyị bụ onye ezi omume, mụ na ndị m bụ ndị mejọrọ.

Exodus 9:27 (UKJV) And Pharaoh sent, and called for Moses and Aaron, and said unto them, I have sinned this time: the LORD is righteous, and I and my people are wicked.

25Mkpụrụ mmiri ahụ tigburu ihe niile dị nʼọhịa, ma mmadụ ma anụmanụ niile dị nʼala Ijipt. O feturu ihe niile na-epu nʼubi, ma ahịhịa niile dị nʼosisi.

26Ma akụkụ ebe mkpụrụ mmiri ndị a na-erughị bụ naanị Goshen, ebe ụmụ Izrel bi.

27Mgbe ahụ Fero ziri ozi ka a kpọ Mosis na Erọn. O kwupụtara nʼihu ha sị, “Nʼoge a, emehiela m. Onyenwe anyị bụ onye ezi omume, mụ na ndị m bụ ndị mejọrọ.

28Kpee ekpere rịọọ Onyenwe anyị nʼihi na oke mkpụrụ mmiri na egbe eluigwe a ezuola. Aga m ekwe ka unu gaa, unu agaghị atụfukwa mgbe.”

29Mosis gwara Fero sị ya, “Mgbe m si nʼobodo a pụọ, aga m esetipụ aka m nʼebe Onyenwe anyị nọ, egbe eluigwe a, na ifufe a nke ya na mkpụrụ mmiri so ga-akwụsịkwa. Site na nke a, ị ga-amata na ụwa niile bụ nke Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.