Ọpụpụ 9

Mkpụrụ mmiri ahụ tigburu ihe niile dị nʼọhịa, ma mmadụ ma anụmanụ niile dị nʼala Ijipt. O feturu ihe niile na-epu nʼubi, ma ahịhịa niile dị nʼosisi.

Exodus 9:25 (UKJV) And the hail stroke throughout all the land of Egypt all that was in the field, both man and beast; and the hail stroke every herb of the field, and brake every tree of the field.

23Mgbe Mosis setịpụrụ mkpanaka ya nʼihu eluigwe, Onyenwe anyị zidatara egbe eluigwe na oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so. Amụma egbe eluigwe chakwara nʼala. Ya mere, Onyenwe anyị zidatara oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so nʼala Ijipt.

24Mkpụrụ mmiri dara, amụma gbukwara nʼihu nakwa nʼazụ. Nʼezie, ọ bụ oke ifufe dị njọ, ụdị nke a na-ahụtụbeghị nʼala Ijipt kemgbe ọ ghọrọ nnukwu mba.

25Mkpụrụ mmiri ahụ tigburu ihe niile dị nʼọhịa, ma mmadụ ma anụmanụ niile dị nʼala Ijipt. O feturu ihe niile na-epu nʼubi, ma ahịhịa niile dị nʼosisi.

26Ma akụkụ ebe mkpụrụ mmiri ndị a na-erughị bụ naanị Goshen, ebe ụmụ Izrel bi.

27Mgbe ahụ Fero ziri ozi ka a kpọ Mosis na Erọn. O kwupụtara nʼihu ha sị, “Nʼoge a, emehiela m. Onyenwe anyị bụ onye ezi omume, mụ na ndị m bụ ndị mejọrọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.