Ọpụpụ 9

Ma akụkụ ebe mkpụrụ mmiri ndị a na-erughị bụ naanị Goshen, ebe ụmụ Izrel bi.

Exodus 9:26 (UKJV) Only in the land of Goshen, where the children of Israel were, was there no hail.

24Mkpụrụ mmiri dara, amụma gbukwara nʼihu nakwa nʼazụ. Nʼezie, ọ bụ oke ifufe dị njọ, ụdị nke a na-ahụtụbeghị nʼala Ijipt kemgbe ọ ghọrọ nnukwu mba.

25Mkpụrụ mmiri ahụ tigburu ihe niile dị nʼọhịa, ma mmadụ ma anụmanụ niile dị nʼala Ijipt. O feturu ihe niile na-epu nʼubi, ma ahịhịa niile dị nʼosisi.

26Ma akụkụ ebe mkpụrụ mmiri ndị a na-erughị bụ naanị Goshen, ebe ụmụ Izrel bi.

27Mgbe ahụ Fero ziri ozi ka a kpọ Mosis na Erọn. O kwupụtara nʼihu ha sị, “Nʼoge a, emehiela m. Onyenwe anyị bụ onye ezi omume, mụ na ndị m bụ ndị mejọrọ.

28Kpee ekpere rịọọ Onyenwe anyị nʼihi na oke mkpụrụ mmiri na egbe eluigwe a ezuola. Aga m ekwe ka unu gaa, unu agaghị atụfukwa mgbe.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.