1O ruo nʼafọ nke iri atọ, nʼọnwa nke anọ, nʼụbọchị nke ise ya, mgbe mụ onwe m na ndị ahụ e mere ka ha gaa biri na mba ọzọ nọ nʼakụkụ iyi ukwu Keba, na e meghere eluigwe mee ka m hụ ọhụ dị iche iche site nʼaka Chineke.
2Nʼụbọchị nke ise nʼọnwa ahụ, ọ bụ nʼafọ nke ise mgbe a dọkpụụrụ eze Jehoiakin jee mba ọzọ,
3okwu Onyenwe anyị ruru Izikiel onye nchụaja nwa Buzi ntị, mgbe ọ nọ nʼakụkụ iyi ukwu Keba, nke dị nʼala ndị Kaldịa. Nʼebe ahụ kwa ka aka Onyenwe anyị nọ dịkwasị ya nʼahụ.
4Elere m anya hụ oke ifufe nke si nʼugwu na-abịa, ahụkwara m oke igwe ojii na amụma nke na-egbuke egbuke; ìhè nke na-enwu nnọọ vaa gbara ya gburugburu. Etiti ọkụ ahụ nwere ihe dịka ọlaọkụ na-amụke amụke.
5Ihe e kere eke anọ dị ndụ, nke yiri mmadụ nʼụdịdị ha, nọkwa nʼetiti oke ihe ahụ.