11Sị ha, ‘Mụ onwe m bụ ihe ama nye unu.’ “Dịka m mere, otu a kwa ka a ga-eme nye ha. Ha ga-aga na mba ọzọ biri ka ndị a dọtara nʼagha.
12“Nwa eze nke nọ nʼetiti ha ga-amaburu ibu ya nʼubu pụọ nʼọchịchịrị, ọ ga-egwupụ mgbidi aja nke obodo site nʼebe ahụ pụọ. Ọ ga-ekpuchikwa ihu ya ka ọ ghara iji anya ya hụ obodo ahụ.
13Ma aga m eji ụgbụ m jide ya, meekwa ka ọ bịaruo Babilọn bụ ala ndị Kaldịa. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ nwụọ, ma ọ gaghị ahụ ya anya.
14Ndị niile gbara ya gburugburu na ndị agha ya niile ka m ga-achụsa nʼala niile, ọ bụkwa mma agha ka m ga-amịpụta jiri chụọ ha ọsọ.
15“Ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m chụsachara ha nʼetiti mba niile dị iche iche, fesaakwa ha nʼala niile.