Izikiel 13

“ ‘Nʼihi ya, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, aga m ebibi unu nʼihi okwu ụgha na ọhụ ụgha unu niile. Edoola m onwe m imegide unu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

Ezekiel 13:8 (UKJV) Therefore thus says the Lord GOD; Because all of you have spoken vanity, and seen lies, therefore, behold, I am against you, says the Lord GOD.

6Ọhụ ha bụ ụgha, otu a, ịjụ ase ha bụkwa ụgha, ha na-asị, “Onyenwe anyị kwupụtara,” ebe Onyenwe anyị ezipụghị ha, ha na-agakwa nʼihu na-atụ anya ka o mezuo okwu ha.

7Ọ bụghị ọhụ ụgha ka unu hụrụ, ọ bụghịkwa okwu ịjụ ase ụgha ka unu kwuru, mgbe unu na-asị, “Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,” nʼagbanyeghị na mụ onwe m ekwughị okwu?

8“ ‘Nʼihi ya, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, aga m ebibi unu nʼihi okwu ụgha na ọhụ ụgha unu niile. Edoola m onwe m imegide unu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

9Aka m ga-emegide ndị amụma niile ahụ bụ ndị na-ahụ ọhụ ụgha, na-agbakwa afa ụgha. Ha a gaghị esonye na otu ọgbakọ ndị m maọbụ bụrụ ndị agụnyekọrọ nʼakwụkwọ ndekọta aha ụlọ nke Izrel, ha agaghị abakwa nʼala ndị Izrel. Mgbe ahụ unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.

10“ ‘Nʼihi na ha eduhiela ndị m, mgbe ha na-asị, “Udo,” ebe udo na-adịghị, nʼihi na mgbe e wuru mgbidi na-esighị ike, ndị amụma ndị a jara ha mma, werekwa nzu techie ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.