7Ọ bụghị ọhụ ụgha ka unu hụrụ, ọ bụghịkwa okwu ịjụ ase ụgha ka unu kwuru, mgbe unu na-asị, “Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,” nʼagbanyeghị na mụ onwe m ekwughị okwu?
8“ ‘Nʼihi ya, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, aga m ebibi unu nʼihi okwu ụgha na ọhụ ụgha unu niile. Edoola m onwe m imegide unu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
9Aka m ga-emegide ndị amụma niile ahụ bụ ndị na-ahụ ọhụ ụgha, na-agbakwa afa ụgha. Ha a gaghị esonye na otu ọgbakọ ndị m maọbụ bụrụ ndị agụnyekọrọ nʼakwụkwọ ndekọta aha ụlọ nke Izrel, ha agaghị abakwa nʼala ndị Izrel. Mgbe ahụ unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
10“ ‘Nʼihi na ha eduhiela ndị m, mgbe ha na-asị, “Udo,” ebe udo na-adịghị, nʼihi na mgbe e wuru mgbidi na-esighị ike, ndị amụma ndị a jara ha mma, werekwa nzu techie ya.
11Ya mere, gwa ndị ahụ jiri nzu techie mgbidi ahụ na ọ ga-ada. Oke mmiri ozuzo nke ga-ezobiga oke ga-ezo, aga m ezitekwa mkpụrụ mmiri dị ukwuu nke ga-ada, na oke ifufe nke ga-akwada ya.