Izikiel 14

Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

Ezekiel 14:12 (UKJV) The word of the LORD came again to me, saying,

10Ha ga-ata ahụhụ nʼihi mmehie ikpe ọmụma ha, dịka ikpe ọmụma dịrị onye na-ajụ ase, otu a ka ọ ga-adịkwa nye onye amụma ụgha ahụ.

11Mgbe ahụ, ụmụ Izrel agaghị esitekwa nʼiso m kpafuo ọzọ. Ha agakwaghị eji mmehie merụọ onwe ha, kama ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara ya.’ ”

12Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

13“Nwa nke mmadụ, ọ bụrụ na ndị bi nʼala emehie megide m, site nʼekwesighị ntụkwasị obi ha, ọ bụrụ na m esetipụ aka m mee ka oke ụnwụ bịakwasị ha, ọ bụrụkwa na m emee ka mmadụ na anụmanụ niile dị nʼala a nwụchasịa,

14a sịkwa na Noa, Daniel na Job bi nʼetiti ya, ha ga-azọpụta naanị onwe ha nʼezi omume ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.