9“ ‘Ọ bụrụ na arafuo onye amụma ahụ ka o buo amụma, ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị rafuru onye amụma ahụ. Aga m esetipụ aka m megide ya, bipụkwa ya site nʼetiti ndị m, bụ Izrel.
10Ha ga-ata ahụhụ nʼihi mmehie ikpe ọmụma ha, dịka ikpe ọmụma dịrị onye na-ajụ ase, otu a ka ọ ga-adịkwa nye onye amụma ụgha ahụ.
11Mgbe ahụ, ụmụ Izrel agaghị esitekwa nʼiso m kpafuo ọzọ. Ha agakwaghị eji mmehie merụọ onwe ha, kama ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara ya.’ ”
12Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
13“Nwa nke mmadụ, ọ bụrụ na ndị bi nʼala emehie megide m, site nʼekwesighị ntụkwasị obi ha, ọ bụrụ na m esetipụ aka m mee ka oke ụnwụ bịakwasị ha, ọ bụrụkwa na m emee ka mmadụ na anụmanụ niile dị nʼala a nwụchasịa,