Izikiel 14

“ ‘Ọ bụrụ na arafuo onye amụma ahụ ka o buo amụma, ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị rafuru onye amụma ahụ. Aga m esetipụ aka m megide ya, bipụkwa ya site nʼetiti ndị m, bụ Izrel.

Ezekiel 14:9 (UKJV) And if the prophet be deceived when he has spoken a thing, I the LORD have deceived that prophet, and I will stretch out my hand upon him, and will destroy him from the midst of my people Israel.

7“ ‘Nʼihi na onye ọbụla nʼụlọ Izrel maọbụ onye ọbụla nʼime ndị ọbịa bi nʼala Izrel, nke kewapụrụ onwe ya site nʼiso m, si otu a mee ka arụsị ọ na-efe baa ya nʼobi, nke na-etinye ihe ịsọ ngọngọ ajọ omume nʼihu ha, mechaa, gakwuru onye amụma maka isite nʼaka ya ịjụta m ase, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-azaghachi ha.

8Aga m edokwa onwe m imegide ha, mee ka ha bụrụ ihe ịmaatụ na ilu nye ndị ọzọ. Aga m esitekwa nʼetiti ndị m wezuga ha. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

9“ ‘Ọ bụrụ na arafuo onye amụma ahụ ka o buo amụma, ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị rafuru onye amụma ahụ. Aga m esetipụ aka m megide ya, bipụkwa ya site nʼetiti ndị m, bụ Izrel.

10Ha ga-ata ahụhụ nʼihi mmehie ikpe ọmụma ha, dịka ikpe ọmụma dịrị onye na-ajụ ase, otu a ka ọ ga-adịkwa nye onye amụma ụgha ahụ.

11Mgbe ahụ, ụmụ Izrel agaghị esitekwa nʼiso m kpafuo ọzọ. Ha agakwaghị eji mmehie merụọ onwe ha, kama ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara ya.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.