16dịka m na-adị ndụ ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ọ bụrụkwarị na ndị ikom atọ ndị a nọ nʼebe a, ha agaghị anapụta ọ bụladị ụmụ ha ndị nwoke maọbụ ụmụ ha ndị nwanyị site nʼịla nʼiyi. Naanị ha ka a ga-azọpụta, ma ala ahụ ga-abụ ihe tọgbọrọ nʼefu.
17“Ọ bụrụ na a sị na m mere ka mma agha bịakwasị ala ahụ, m sị, ‘Ka mma agha gabiga site nʼala ahụ niile gburugburu,’ ma gbuo mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime ya,
18dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, a sịkwarị na ndị ikom atọ ndị a nọ nʼala ahụ, ha agaghị anapụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom site nʼịla nʼiyi. Kama, ọ bụ naanị ha onwe ha ka a ga-anapụta.
19“Ọzọkwa, ọ bụrụ na m eziga oke iwe m site nʼajọ ọrịa na-efe efe, ọ bụrụ na ọrịa ahụ egbuo mmadụ na anụmanụ ha niile,
20dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, a sịkwa na Noa, Daniel na Job bi nʼime ya, ha agaghị anapụta ụmụ ha ndị ikom maọbụ ndị inyom site nʼịla nʼiyi. Ha ga-azọpụta naanị onwe ha nʼezi omume ha.