Izikiel 14

“Ọ bụrụ na a sị na m mere ka mma agha bịakwasị ala ahụ, m sị, ‘Ka mma agha gabiga site nʼala ahụ niile gburugburu,’ ma gbuo mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime ya,

Ezekiel 14:17 (UKJV) Or if I bring a sword upon that land, and say, Sword, go through the land; so that I cut off man and beast from it:

15“Asị na m eziga anụ ọhịa ọjọọ ka ha bịa bibie ala ahụ, mee ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu meekwa ka mmadụ ọbụla ghara ị site nʼime ya gafee nʼihi anụ ọhịa ndị ahụ,

16dịka m na-adị ndụ ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ọ bụrụkwarị na ndị ikom atọ ndị a nọ nʼebe a, ha agaghị anapụta ọ bụladị ụmụ ha ndị nwoke maọbụ ụmụ ha ndị nwanyị site nʼịla nʼiyi. Naanị ha ka a ga-azọpụta, ma ala ahụ ga-abụ ihe tọgbọrọ nʼefu.

17“Ọ bụrụ na a sị na m mere ka mma agha bịakwasị ala ahụ, m sị, ‘Ka mma agha gabiga site nʼala ahụ niile gburugburu,’ ma gbuo mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime ya,

18dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, a sịkwarị na ndị ikom atọ ndị a nọ nʼala ahụ, ha agaghị anapụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom site nʼịla nʼiyi. Kama, ọ bụ naanị ha onwe ha ka a ga-anapụta.

19“Ọzọkwa, ọ bụrụ na m eziga oke iwe m site nʼajọ ọrịa na-efe efe, ọ bụrụ na ọrịa ahụ egbuo mmadụ na anụmanụ ha niile,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.