21Ma i gburu ụmụ m, jiri ha chụọ aja nye arụsị!
22Nʼoge ndị a niile ị na-akwa iko, na-eme ihe arụ ndị a niile, o metụbeghị gị nʼobi ka i cheta ụbọchị niile ndị ahụ ị bụ nwantakịrị, mgbe ị nọ na-agba ọtọ, mgbe ọbara jupụtara gị nʼahụ.
23“ ‘Ahụhụ, ahụhụ, ga-adịrị gị, ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. Tinyekwara ajọ omume gị niile,
24i wuuru arụsị gị ụlọ ebe ịkwa iko, wuokwa ụlọ arụsị ndị ọzọ nʼakụkụ okporoụzọ niile.
25I wuuru onwe gị ebe ịchụ aja e wuliri elu dị iche iche nʼisi ụzọ niile, si otu a merụọ mma gị. Nʼebe ahụ ka ị na-anọ na-emeghere onye ọbụla gafetara ụkwụ gị abụọ, mee ka ịkwa iko gị na-amụbanye.