54Ka i nwee ike bụrụ ọnọdụ ihere gị, ka ihere mekwa gị nʼihi ihe niile i mere, nʼịkasị ha obi.
55Ọzọ ndị ụmụnne gị nwanyị bụ Sọdọm na Sameria na ụmụ ha ndị inyom ga-alọta nʼọnọdụ mbụ ha; gị na ụmụ gị ndị inyom ga-alọtakwa nʼọnọdụ mbụ unu.
56Ma ị pụghị emeghe ọnụ gị kpọọ aha nwanne gị nwanyị bụ Sọdọm nʼụbọchị nganga gị,
57tupu e kpughe ajọ omume gị. Ọ bụladị otu ahụ, ugbu a ị bụ ihe ịkwa emo nye ndị ada Edọm na ndị agbataobi ya niile, na ndị ada ndị Filistia. Ndị niile nọ gị gburugburu na-elelịkwa gị anya.
58Ị ga-anata ụgwọ ọrụ nke ịkwa iko gị, na ihe arụ ndị ọzọ ị na-eme. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.