Izikiel 16

Ị ga-anata ụgwọ ọrụ nke ịkwa iko gị, na ihe arụ ndị ọzọ ị na-eme. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

Ezekiel 16:58 (UKJV) You have borne your lewdness and yours abominations, says the LORD.

56Ma ị pụghị emeghe ọnụ gị kpọọ aha nwanne gị nwanyị bụ Sọdọm nʼụbọchị nganga gị,

57tupu e kpughe ajọ omume gị. Ọ bụladị otu ahụ, ugbu a ị bụ ihe ịkwa emo nye ndị ada Edọm na ndị agbataobi ya niile, na ndị ada ndị Filistia. Ndị niile nọ gị gburugburu na-elelịkwa gị anya.

58Ị ga-anata ụgwọ ọrụ nke ịkwa iko gị, na ihe arụ ndị ọzọ ị na-eme. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

59“ ‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, Aga m akwụghachi gị dịka omume gị si dị, nʼihi na ị ledara iyi ahụ ị ṅụrụ anya site nʼimebi ọgbụgba ndụ ahụ.

60Ma otu ọbụla o si dị, aga m edebezu nkwa ahụ niile m kwere gị mgbe ị dị na nwantakịrị. Aga m eme ka ọgbụgba ndụ ahụ dị nʼetiti mụ na gị guzosie ike ruo ebighị ebi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.