6“ ‘Ma mgbe m si nʼebe ahụ ị tọgbọ na-agafe, ahụrụ m gị ka i chịlịri ụkwụ gị, ọbara jukwara gị ahụ, dịka ị dina nʼime ọbara gị. Nʼoge ahụ, ihe pụrụ m nʼọnụ bụ, “Dị ndụ.”
7Emere m ka ị too dịka osisi na-eto eto nʼime ọhịa. I tolitere, too ogologo ma tozuo oke na nwanyị, ị kpụrụ ara, agịrị isi gị pukwara, ma gị onwe gị gba ọtọ.
8“ ‘Emesịa, a gafere m nʼakụkụ gị, mgbe m lere gị anya ahụrụ m na i tozuola onye mmadụ ga-ahụ nʼanya. A gbasapụrụ m akụkụ akwa m nʼahụ gị, jiri ya kpuchie ọtọ gị. Aṅụrụ m gị iyi, mụ na gị gbara ndụ, ị ghọkwara nke m. Ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
9“ ‘Eji m mmiri saa gị ahụ, sachapụ ọbara dị gị nʼahụ, teekwa gị mmanụ.
10Enyere m gị akwa ọcha na uwe a kpara nke ọma, nke i ji kpuchie ahụ gị. Nyekwa gị akpụkpọụkwụ e ji ezi akpụkpọ kwaa, jirikwa ezi akwa ọcha na uwe ndị dị oke ọnụ kpuchie gị.