2“Gịnị ka unu bụ mmadụ na-ekwu mgbe unu na-atụ ilu a banyere ala Izrel? “ ‘Ndị bụ nna eriela mkpụrụ vaịnị na-achaghị acha, eze ụmụntakịrị a na-eru ha izizi.’
3“Dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, unu agaghị atụkwa ilu a ọzọ nʼala Izrel.
4Nʼihi na mkpụrụobi niile bụ nke m, ma nke nna ma nke nwa, ha niile bụ nke m. Mkpụrụobi ọbụla mehiere bụ nke ga-anwụ.
5“Ọ bụrụ na-enwere otu onye ezi omume nke na-eme naanị ihe ziri ezi na ihe dị mma,
6onye na-adịghị eje nʼugwu iri oriri maọbụ welie anya ya nʼebe arụsị niile nke Izrel dị, onye na-adịghị emerụ nwunye onye agbataobi ya, maọbụ dinakwuru nwanyị nọ nʼoge nsọ ya.