Izikiel 20

Aga m akpọpụta unu site na mba dị iche iche, chịkọtaa unu site na mba ndị ahụ a chụsasịrị unu. Ọ bụ aka m dị ike, aka m setịpụrụ na ọnụma a wụpụrụ ka m ga-eji mee ya.

Ezekiel 20:34 (UKJV) And I will bring you out from the people, and will gather you out of the countries wherein all of you are scattered, with a mighty hand, and with a stretched out arm, and with fury poured out.

32“ ‘Unu na-ekwu nʼobi unu sị, “Anyị chọrọ ịdị ka mba ndị ọzọ, dịka agbụrụ ndị ọzọ nọ nʼụwa, ndị na-akpọ isiala nye osisi na nkume.” Ma ihe unu bu nʼobi agaghị emezu.

33Dịka m na-adị ndụ, aga m eji aka ike na ogwe aka e setịrị eseti nakwa nwụpụ nke oke iwe m chịa unu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.

34Aga m akpọpụta unu site na mba dị iche iche, chịkọtaa unu site na mba ndị ahụ a chụsasịrị unu. Ọ bụ aka m dị ike, aka m setịpụrụ na ọnụma a wụpụrụ ka m ga-eji mee ya.

35Aga m akpọbata unu nʼọzara nke mba niile, nọdụ nʼebe ahụ kpee unu ikpe nʼihu nʼihu.

36Dịka m kpere nna nna unu ha ikpe nʼọzara nke dị nʼala Ijipt, otu a ka m ga-esi kpee unu ikpe, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.