34Aga m akpọpụta unu site na mba dị iche iche, chịkọtaa unu site na mba ndị ahụ a chụsasịrị unu. Ọ bụ aka m dị ike, aka m setịpụrụ na ọnụma a wụpụrụ ka m ga-eji mee ya.
35Aga m akpọbata unu nʼọzara nke mba niile, nọdụ nʼebe ahụ kpee unu ikpe nʼihu nʼihu.
36Dịka m kpere nna nna unu ha ikpe nʼọzara nke dị nʼala Ijipt, otu a ka m ga-esi kpee unu ikpe, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
37Aga m eme ka unu si nʼokpuru mkpanaka m gafee, aga m akpọbata unu na njikọ nke ọgbụgba ndụ ahụ.
38Aga m esi nʼetiti unu wezuga ndị na-ekwe ntị ike ma na-enupu isi megide m. Ọ bụ ezie na m ga-akpọpụta ha site nʼala ahụ ha bi, ma ha agaghị abata nʼala Izrel. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.