36Dịka m kpere nna nna unu ha ikpe nʼọzara nke dị nʼala Ijipt, otu a ka m ga-esi kpee unu ikpe, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
37Aga m eme ka unu si nʼokpuru mkpanaka m gafee, aga m akpọbata unu na njikọ nke ọgbụgba ndụ ahụ.
38Aga m esi nʼetiti unu wezuga ndị na-ekwe ntị ike ma na-enupu isi megide m. Ọ bụ ezie na m ga-akpọpụta ha site nʼala ahụ ha bi, ma ha agaghị abata nʼala Izrel. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
39“ ‘Ma banyere unu, bụ ụlọ Izrel, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Gaanụ fee arụsị unu niile dị iche iche, onye ọbụla nʼime unu. Ma emesịa, unu aghaghị ịṅa m ntị, ọ dịghịkwa mgbe unu ga-eji onyinye na arụsị unu niile merụọ aha nsọ m.
40Nʼihi na ọ bụ nʼelu ugwu m dị nsọ, nke bụ elu ugwu ukwu nke Izrel, ka Izrel niile ga-anọ fee m. Nʼebe ahụ ka m ga-anọkwa nabata onyinye unu na onyinye pụrụ iche unu, na aja nsọ unu dị iche iche. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.