Izikiel 21

Amụọla ya nʼihi oke ogbugbu nke gaje ịdị, hichakwaa ya nke ọma ka ọ na-egbu dịka amụma. “ ‘Anyị ọ ga-aṅụrị ọṅụ na mkpara eze nwa m nwoke Juda? Mma agha na-elelị mkpara niile dị otu a anya.

Ezekiel 21:10 (UKJV) It is sharpened to make a sore slaughter; it is furbished that it may glitter: should we then make delight? it despises the rod of my son, as every tree.

8Ọzọkwa, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

9“Nwa nke mmadụ buo amụma sị, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: “ ‘Lee, mma agha, lee, mma agha, a mụọla ya, hichakwaa ya.

10Amụọla ya nʼihi oke ogbugbu nke gaje ịdị, hichakwaa ya nke ọma ka ọ na-egbu dịka amụma. “ ‘Anyị ọ ga-aṅụrị ọṅụ na mkpara eze nwa m nwoke Juda? Mma agha na-elelị mkpara niile dị otu a anya.

11“ ‘E nyere iwu ka e hichazie mma agha ahụ, ka e jidekwa ya nʼaka. A mụọla ya, hichazie ya. E doziela ya maka onye ahụ ga-eji ya laa ndụ nʼiyi.

12Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa ma kwasie akwa ike, nʼihi na ọ bụ megide ndị m ọ bụkwa megide ndịisi Izrel niile. A na-atụnyere ha mma agha ga-egbu ha, ha na ndị m. Nʼihi ya, tie aka gị nʼobi gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.