9“Nwa nke mmadụ buo amụma sị, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: “ ‘Lee, mma agha, lee, mma agha, a mụọla ya, hichakwaa ya.
10Amụọla ya nʼihi oke ogbugbu nke gaje ịdị, hichakwaa ya nke ọma ka ọ na-egbu dịka amụma. “ ‘Anyị ọ ga-aṅụrị ọṅụ na mkpara eze nwa m nwoke Juda? Mma agha na-elelị mkpara niile dị otu a anya.
11“ ‘E nyere iwu ka e hichazie mma agha ahụ, ka e jidekwa ya nʼaka. A mụọla ya, hichazie ya. E doziela ya maka onye ahụ ga-eji ya laa ndụ nʼiyi.
12Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa ma kwasie akwa ike, nʼihi na ọ bụ megide ndị m ọ bụkwa megide ndịisi Izrel niile. A na-atụnyere ha mma agha ga-egbu ha, ha na ndị m. Nʼihi ya, tie aka gị nʼobi gị.
13“ ‘Ọnwụnwa aghaghị ịbịa. Ma gịnị ga-eme, ma ọ bụrụ na mkpara eze nke mma agha na-elelị anya, agaghị nʼihu na-adịgide? Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’