Izikiel 21

Ọzọkwa, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

Ezekiel 21:8 (UKJV) Again the word of the LORD came unto me, saying,

6“Nʼihi ya, sụọ ude, nwa nke mmadụ, sụọ ude nʼihu ha nʼọnọdụ oke mwute na obi mgbawa.

7Mgbe ha jụrụ gị, ‘Gịnị kpatara i ji asụ ude?’ Ị ga-asị, ‘Nʼihi ozi nke na-abịa. Obi niile ga-agbaze site nʼegwu, aka niile ga-akụdakwa; mmụọ niile ga-ada mba, ikpere niile ga-ede mmiri site nʼamịrị.’ Ọ na-abịa, ọ ghaghị imezu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”

8Ọzọkwa, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

9“Nwa nke mmadụ buo amụma sị, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: “ ‘Lee, mma agha, lee, mma agha, a mụọla ya, hichakwaa ya.

10Amụọla ya nʼihi oke ogbugbu nke gaje ịdị, hichakwaa ya nke ọma ka ọ na-egbu dịka amụma. “ ‘Anyị ọ ga-aṅụrị ọṅụ na mkpara eze nwa m nwoke Juda? Mma agha na-elelị mkpara niile dị otu a anya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.