Izikiel 21

Gị mma agha, ebe ọbụla ị chọrọ, ebe ọbụla i nwere ike, gbuo onye ọbụla, ma ọ nọ gị nʼaka nri ma ọ nọ gị nʼaka ekpe.

Ezekiel 21:16 (UKJV) Go you one way or other, either on the right hand, or on the left, anywhere your face is set.

14“Nʼihi ya, buo amụma, nwa nke mmadụ. Kụkọọ ọbụ aka gị abụọ, ka mma agha gbuo ugboro abụọ e, ọ bụladị ugboro atọ. Ọ bụ mma agha e debere maka ogbugbu, nke e debere maka oke ogbugbu nke ga-abịachibido ha gburugburu.

15Ka obi ha gbazee site nʼegwu, ka ndị na-ada ada hie nne, nʼihi na edoziela m mma agha ahụ nʼọnụ ụzọ ama ha niile maka oke ogbugbu. Lee, mma agha ahụ na-egbu amụma, etinyela ya nʼaka onye ga-egbu oke ogbugbu.

16Gị mma agha, ebe ọbụla ị chọrọ, ebe ọbụla i nwere ike, gbuo onye ọbụla, ma ọ nọ gị nʼaka nri ma ọ nọ gị nʼaka ekpe.

17Mụ onwe m ga-akụkọtakwa ọbụ aka m, ime ka iwe m jụrụ. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.”

18Okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.