16Gị mma agha, ebe ọbụla ị chọrọ, ebe ọbụla i nwere ike, gbuo onye ọbụla, ma ọ nọ gị nʼaka nri ma ọ nọ gị nʼaka ekpe.
17Mụ onwe m ga-akụkọtakwa ọbụ aka m, ime ka iwe m jụrụ. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.”
18Okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
19“Nwa nke mmadụ mee ụzọ abụọ nke mma agha eze Babilọn ga-eso. Ka ụzọ abụọ ndị a malite nʼotu obodo. Dee ihe ngosi manye ha nʼebe ahụ ụzọ wara abụọ.
20Mee ka otu nʼime ụzọ ndị ahụ bụrụ ebe mma agha ga-esi bịa megide Raba nke Amọn, ka nke ọzọ megide Juda na Jerusalem, bụ ebe e wusiri ike.