Izikiel 21

Mụ onwe m ga-akụkọtakwa ọbụ aka m, ime ka iwe m jụrụ. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.”

Ezekiel 21:17 (UKJV) I will also strike mine hands together, and I will cause my fury to rest: I the LORD have said it.

15Ka obi ha gbazee site nʼegwu, ka ndị na-ada ada hie nne, nʼihi na edoziela m mma agha ahụ nʼọnụ ụzọ ama ha niile maka oke ogbugbu. Lee, mma agha ahụ na-egbu amụma, etinyela ya nʼaka onye ga-egbu oke ogbugbu.

16Gị mma agha, ebe ọbụla ị chọrọ, ebe ọbụla i nwere ike, gbuo onye ọbụla, ma ọ nọ gị nʼaka nri ma ọ nọ gị nʼaka ekpe.

17Mụ onwe m ga-akụkọtakwa ọbụ aka m, ime ka iwe m jụrụ. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.”

18Okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

19“Nwa nke mmadụ mee ụzọ abụọ nke mma agha eze Babilọn ga-eso. Ka ụzọ abụọ ndị a malite nʼotu obodo. Dee ihe ngosi manye ha nʼebe ahụ ụzọ wara abụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.