25“ ‘Gị onye rụrụ arụ, onye na-emebi iwu, gị nwa eze nʼIzrel, gị onye ụbọchị ahụhụ ya rurula,
26ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, yipụ okpueze gị, ya na akwa ị na-atụghị nʼisi. Ihe agaghị adịkwa dịka o si adị na mbụ. A ga-ebuli ndị dị ala, wedata ndị dị elu.
27Mbibi, mbibi. Aga m eme ka ọ ghọọ ihe e bibiri ebibi. A gaghị eweghachikwa ya ọzọ tutu ruo mgbe onye ahụ o ruuru nʼizi ezi bịara. Ya ka m ga-enyefe ya nʼaka.’
28“Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, buo amụma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru megide ndị Amọn nʼihi ịkwa emo ha: “ ‘Lee mma agha, lee mma agha, nke a mịpụtara maka oke ogbugbu. E hichaziela ya mee ka ọ dị nkọ iripịa, ka ọ na-egbu amụma dịka amụma egbe eluigwe.
29Nʼagbanyeghị ọhụ ụgha nke a na-ahụ banyere unu, na a jụtakwala ase ụgha banyere unu, a ga-etinye ya nʼolu ndị mmebi iwu ahụ a gaje igbu egbu, bụ ndị ụbọchị ha rurula, ndị oge ịta ahụhụ ha zukwara.