Izikiel 21

Nʼagbanyeghị ọhụ ụgha nke a na-ahụ banyere unu, na a jụtakwala ase ụgha banyere unu, a ga-etinye ya nʼolu ndị mmebi iwu ahụ a gaje igbu egbu, bụ ndị ụbọchị ha rurula, ndị oge ịta ahụhụ ha zukwara.

Ezekiel 21:29 (UKJV) While they see vanity unto you, while they divine a lie unto you, to bring you upon the necks of them that are slain, of the wicked, whose day has come, when their iniquity shall have an end.

27Mbibi, mbibi. Aga m eme ka ọ ghọọ ihe e bibiri ebibi. A gaghị eweghachikwa ya ọzọ tutu ruo mgbe onye ahụ o ruuru nʼizi ezi bịara. Ya ka m ga-enyefe ya nʼaka.’

28“Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, buo amụma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru megide ndị Amọn nʼihi ịkwa emo ha: “ ‘Lee mma agha, lee mma agha, nke a mịpụtara maka oke ogbugbu. E hichaziela ya mee ka ọ dị nkọ iripịa, ka ọ na-egbu amụma dịka amụma egbe eluigwe.

29Nʼagbanyeghị ọhụ ụgha nke a na-ahụ banyere unu, na a jụtakwala ase ụgha banyere unu, a ga-etinye ya nʼolu ndị mmebi iwu ahụ a gaje igbu egbu, bụ ndị ụbọchị ha rurula, ndị oge ịta ahụhụ ha zukwara.

30“ ‘Mịghachinụ ya nʼọbọ ya. Nʼebe ahụ e kere unu nʼala nna nna unu ha, Aga m ekpe unu ikpe.

31Aga m awụkwasị unu ọnụma m, kukwasịkwa unu ikuku nke oke iwe m. Aga m ewere unu nyefee nʼaka ndị na-eme ihe ike, ndị bụ ọka na ịla mmadụ nʼiyi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.