Izikiel 21

“ ‘Mịghachinụ ya nʼọbọ ya. Nʼebe ahụ e kere unu nʼala nna nna unu ha, Aga m ekpe unu ikpe.

Ezekiel 21:30 (UKJV) Shall I cause it to return into his sheath? I will judge you in the place where you were created, in the land of your nativity.

28“Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, buo amụma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru megide ndị Amọn nʼihi ịkwa emo ha: “ ‘Lee mma agha, lee mma agha, nke a mịpụtara maka oke ogbugbu. E hichaziela ya mee ka ọ dị nkọ iripịa, ka ọ na-egbu amụma dịka amụma egbe eluigwe.

29Nʼagbanyeghị ọhụ ụgha nke a na-ahụ banyere unu, na a jụtakwala ase ụgha banyere unu, a ga-etinye ya nʼolu ndị mmebi iwu ahụ a gaje igbu egbu, bụ ndị ụbọchị ha rurula, ndị oge ịta ahụhụ ha zukwara.

30“ ‘Mịghachinụ ya nʼọbọ ya. Nʼebe ahụ e kere unu nʼala nna nna unu ha, Aga m ekpe unu ikpe.

31Aga m awụkwasị unu ọnụma m, kukwasịkwa unu ikuku nke oke iwe m. Aga m ewere unu nyefee nʼaka ndị na-eme ihe ike, ndị bụ ọka na ịla mmadụ nʼiyi.

32Unu ga-aghọkwa mmanụ a na-awụnye nʼọkụ. A ga-awụsịkwa ọbara unu nʼala unu. Ọ dịkwaghị onye ga-echeta unu ọzọ, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.