Izikiel 21

sị ala Izrel otu a, ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Mụ onwe m na-emegide gị. Aga m esite nʼọbọ mịpụta mma agha m, site na gị gbuchapụ ma onye ezi omume na onye ajọ omume.

Ezekiel 21:3 (UKJV) And say to the land of Israel, Thus says the LORD; Behold, I am against you, and will draw forth my sword out of his sheath, and will cut off from you the righteous and the wicked.

1Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

2“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼụzọ Jerusalem, buo amụma megide ụlọnsọ ukwu ahụ. Bukwaa amụma megide ala Izrel

3sị ala Izrel otu a, ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Mụ onwe m na-emegide gị. Aga m esite nʼọbọ mịpụta mma agha m, site na gị gbuchapụ ma onye ezi omume na onye ajọ omume.

4Nʼihi na m na-aga igbuchapụ ndị ezi omume na ndị ajọ omume, mma agha m ga-esite nʼọbọ ya pụta megide onye ọbụla site nʼugwu ruo na ndịda.

5Mgbe ahụ, mmadụ niile ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị amịpụtala mma agha m site nʼọbọ ya, ọ gaghị amịghachi baa nʼọbọ ọzọ.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.